Skip to content

OMISORE CHỌRỌ KA ỌCHỊCHỊ ETITI CHỌPỤTA NDỊ GBỤRỤ BOLA IGE

 Sen. Iyiola Omisore bụ onye na-apụta maka ọkwa gọvanọ n’otu pati “Social Democratic Party” na steeti Osun agwala ọchịchị etiti ka ha chọpụta ndị gbụrụ Bola Ige bụ onye bụbụrụ minista na-ahụ maka ikpe ziri ezi n’oge gara aga.

Omisore kwụrụ nke a mgbe ha na-enwe mkparịta ụka maka ntuliaka elu maka ọkwa onye ga-abụ gọvanọ bụkwa nke a ga-eme n’oge n’adịghị anya.

Gukwuo: BUHARI AHỌPỤTALA ZAINAB AHMED DIKA MINISTA NA-AHỤ MAKA EGO

Nwamadị a bụ Omisore bụ onye e boro ebubo na-aka ya dị n’ogbụgbụ Ige, kwuru na Sọnde na ya nwere nchekwube n’ọchịchị etiti ga-achọpụta ndị gbụrụ nwaamadị ahụ bụ Bola Ige.

Omisore ka a nwuchịrị ma kpekwaa ikpe n’oge gara aga n’ihi ogbụgbụ e gbụrụ Ige, ma e mechara hapu ya.  Ọtụtụ oge ka Omisore gọọrọ ọnụ ya na-aka ya adịghị n’ogbụgbu e gbụrụ Ige.