BUHARI AHỌPỤTALA ZAINAB AHMED DIKA MINISTA NA-AHỤ MAKA EGO

0
zainab

Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari ahọpụtala Zainab Ahmed dịka minister ọhụrụ na-ahụ maka ego. Buhari mere nke a mgbe Kemi Adeosun gbara arụkwaghị m n’ọru.

Adeosun gbara arụkwaghị m na fridee ịzụụka gara aga n’ihi ebubo na-akwụkwọ eji efe ala nna anyị bụ adịgboroja bụkwa nke o nwetara n’ụzọ iwu na-akwadoghi.

Gukwuo: ỌCHỊCHI ETITI GA-EWE UMỤ OKORỌBỊA PỤKỤ ISE N’ỌRỤ

Onyeisiala kelere Kemi Adeosun n’ihi ọrụ ọ rụru obodo anyị mgbe ọ bụ minista na-ahụ maka ego ma gọkwara ya ọfọ ọganiihụ.

Ahmed ka a mụrụ na steeti Kaduna. O nwetara dịgrịị mbụ ya na ‘Accounting’ na  Mahadum Ahmadu Bello n’afọ 1981. O nwetakwara ‘Masters degree’ ya site na Mahadum Ogun steeti nke dị n’Abeokuta.

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here