Skip to content

NDI IGBO AGAGHị ESONYE NA NTULIAKA AFỌ 2019 – NNAMDI KANU

Onyeisi òtụ̀ ‘Indigenous People of Biafra’ (IPOB) bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ndị Igbo agaghị esonye na ntuliaka a ga-eme n’ala anyị n’afọ 2019.

Kanu kwụrụ nke a n’ụbọchị Sọnde mgbe ọ na-agbasara mba ụwa ozi site na Jerusalem. Kanu gara n’ihgu kwuo na ihe ndị Igbo chọrọ bụ ‘Referendum’ bụ nke ga-enyere ha aka inweta Biafra.

GUKWUO: NDI GỌVANỌ NỌ N’APC GA-EZUKO N’ABUJA ECHI MAKA IWEPU OSHIOMHOLE

Ọ kwukwara na ya ga-eme ihe niile ya nwere ike ime iji hụ na Biafra bịara na mmezu.

O jịkwa ohere ahụ kelee Ben Nwabueze maka ịnọnyere ya n’oge a na-ekpe ya ikpe n’ala anyị. O zigakwara  Ayodele Fayose ozi ma kwuo na ndị Biafra ga-anọnyere ya n’oge a ndị EFCC n’ekpe ya ikpe.