NDI GỌVANỌ NỌ N’APC GA-EZUKO N’ABUJA ECHI MAKA IWEPU OSHIOMHOLE

2
APC Governors

Ndị gọvanọ nọ na òtù patị APC ga-ezụkọ n’Abuja n’ụbọchị Tuzdee maka iwepu onyeisioche pati ahụ n’ala anyị bụ Adams Oshiomhole.

Ndị gọvanọ ndị a n’ewe iwe ka onyeisioche patị ahụ si hazie ntuliaka ime ụlọ nke patị ahụ mere na steeti dị iche iche.

Anyị ga-echeta na APC emeghị ntuliaka ime ụlọ na steeti niile. Na steeti ụfọdu, APC jị aka ha họrọ onye ga-eji aha patị ahụ dọọ ọkwa. Nke a bụ nke were ndị gọvanọ ndị a iwe n’ebe ọ dị ụkwụụ.

Ndị gọvanọ ndị a ga-ezukọ n’Abuja echi iji kpebie ihe bụ ebumnuche ha.

2 KWURU

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here