Skip to content

MESSI, RONALDO NA MODRIC EKWESIGHỊ INWETA BALLON D’OR NKE AFỌ A – GRIEZMANN

Nwaamadị mba France na-agbara òtù egwu bọọlụ ‘Atletico Madrid’ bọọlụ bụ Antoine Griezmann ekwuola na Messi, Ronaldo na Modric ewkesighị inweta mmeri na Ballon D’or nke afọ a.

Griezmann kwenyere na Ballon D’or kwesiri ịgara otu onye n’ime ndị bụụrụ ịkọ mba ụwa nke FIFA hazịrị n’ọnwa Jụlịa afọ a.

GUKWUO: ONYE NLEKỌTA ÒTÙ EGWU BỌỌLỤ MBA LIBYA AGBALA ARỤKWAGHị M

Griezmann so n’otu n’ime ndị bụụrụ ịkọ mba ụwa ahụ bụkwa nke agbara na mba Russia. Nwaamadị mba France a n’eche na dịka obodo ya jisiriike gbaa mbọ buụrụ ịkọ ahụ, n’otu onye n’ime ha kwesiri inweta Ballon D’or nke afọ a.

A ga-echata na Griezmann so n’ime mmadụ ịrị atọ ahọpụtara maka inweta mmeri na Ballon D’or nke afọ a. Ndị ọzọ gụnyere, Kylian Mbappe, Paul Pogba, N’Golo Kante, Raphael Varane na Hugo Lloris bụcha ndị bụ ndị mba France.