Skip to content

ANYị ACHỌGHị ỌKWA OSOTE ONYEISIALA, NYE ANYị ‘REFERENDUM’ – IPOB

IPOB ekwuola na ha achọghị ima ebe a ga-esi weputa osote onyeisiala na ntuliaka a ga-eme n’afọ 2019, kama ihe ha chọrọ bụ ‘referendum’.

Ọ bụ onye mgbasa ozi ha bụ Emma Powerful Kwuru nke a. Ọ gara n’ihu kwuo na ihe ha chọrọ bụ ‘Referendum’. O kwukwara na ndị Biafra ga-ekpebi ma ha ka chọrọ ịnọ n’ime NaỊjịrịa tụpụ enwee ntuliaka ọ bụla n’ala Biafra.

GUKWUO: NAỊJịRịA CHỌRỌ ONYEISIALA AKỤNAỤBA DORO ANYA – OBASANJO

Ọ gwara ndị ndụ nọ n’ala Igbo ka ha cheta na ọ bụ Atiku, Saraki, Obasanjo, Tambuwal na Kwamkwaso mere Jonathan n’enwetaghị mmeri na ntuliaka e mere n’afọ 2015. Ọ gwakwara Ohanaeze ndị Igbo ka ha teta n’ụra ma hụ ndị Fulani dịka ndị ọjọọ.