Skip to content

NDị UWEOJII ANWỤCHIELA OTU NWOKE MAKA IMEPỤTA MMANYA ỌKỤ ADIGBOROJA

Ndị uweojii nọ na steeti Legọs anwụchiela otu nwoke gbara afọ ịrị atọ na asatọ maka imeputa nakwa ire mmanya ọkụ adigboroja.

Emmanuel Nwodu bụ onye anwụchịrị n’akụkụ ahịa dị na Moshalashi Agege ebe obu katọnụ mmanya ọkụ abụọ bụ adigboroja.

GUKWUO: OSINBAJO EBELATALA ỌNỤ EGO E JI EDENYE AHA EJI EME AZỤMAHịA N’AKWỤKWỌ

Mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ, o kwuru na ya na-emeputa mmanya ọkụ adigboroja ahụ n’ime ụlọ ebe ọ na-azụ ahịa din a Moshalashi, Agege.

Nwodu mechara dụrụ ndị uweojii gaa ebe ahụ ọ na-emeputa mmanya ọkụ adigboroja ndị ahụ.

Mgbe ndị uweojii ruru n’ebe ahụ, he nwetara ọtụtụ mmanya ọkụ bụ adigboroja. Ha kpọpụrụ ya ụlọikpe n’ụbọchị Wednezde.