Skip to content

NDI UWEOJII ANWỤCHIELA OTU NWOKE CHỌRỌ IGBU ATIKU ABUBAKAR

 Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Augustus Akpan maka ịchọ igbu osote onyeisiala n’oge gara aga bụ Atiku Abubakar nakwa ezinụlọ ya.

Akpan kwuru na ya ga-eme nke a ọ bụrụ ma Atiku akwusighị ebumnuche ya ịzọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2019.

GUKWUO: NLC EBIDOLA NFANYEAKA N’UKWU TÁÀ

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ bụ Jimoh Moshood n’ozi ya n’ụbọchị Wenezdee kwuru na Akpan bụ onye Edemaya nke dị n’kopuru ọchịchị Ikot Abasi nke dị na steeti Akwa Ibom. Moshood kwuru na Akpan ji ekwe nti zigara nwunye Atiku nakwa nwa ya nwaanyị ozi.

Akpan kwukwara na ya ga-akwaso nwunye Atiku nakwa ụmụ ya ndị nke nwaanyị ịko n’ike ma ọ bụrụ na Atiku akwusịghị ebumnuche ya ịzọ ọkwa onyeisiala ala anyị n’afọ 2019.