Skip to content

UNESCO Akwanyerena Onye Na Eti Egwu Na Ala Aanyi Ugwu, Site N’Inye Ya Ihe Nrite

UNESCO Akwanyerena Onye Na Eti Egwu Na Ala Aanyi Ugwu, Site N’Inye Ya Ihe Nrite

Mazi Victor Uwaifo bu onye ama ama n’ihi otu osi eji opi,ubo nkiti Nakwa ubo akwara eti egwu nke ya,

Mazi Victor Uwaifo buzi onye otu jikotara mba nile n’ihe gbasara agumakwukwo, ime mchoputa nakwa omenala(United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization -UNESCO)na asusu bekee, kwanyere ugwu site n’inye ya ihe nrite kachasi elu.

Ihe nrite a bu nke ana enye ndi nwetegoro akara di elu ma obu jiri amamihe ha na aru oru site n’iji ihe omenala ma obu ngwa egwu odinala wee na eti egwu ha ma na emekwa ka ya bu egwu nwee ihe iribama.

Atumatua bu nke onye naijiria  bi na mba obodo France akporo Curator Bose Fagbemi hiwere, atumatua bu nke oji wee nwee ihe akporo ngaghari nke ihe ngosi aka oru nakwa ndi n’eti egwu n’ime otutu ime obodo naijiria nakwa ndi mba ofesi gunyere ,France, Ghana, United Kingdom, United State, Ndi Caribbeans nakwa South Africa.

Ehiwere atumatua iji wee na enwe anuri ma na eto aka oru Mazi Victor Uwaifo dika onye tuzugoro utu ya dika onye n’eti egwu na naijiria nakwa dika onye ana akwanyere ugwu gbaa gburugburu Africa nakwa Uwa nile.

Agba ozo nke na abia abia bu ndi mba obodo France ga akwalite ya n’ime onwa October bukwanu nke danyere n’izu eji eme emume ikwalite omenala nakwa njirimara ala anyi bu naijiri ,bukwanu nke isi onudu naijiria(Nigerian Embassy) na mba obodo Paris ga akwado.

Ahutara Mazi Victor Uwaifo dika onye choputara ma meputa opi nwere olu abuo nakwa eriri ya di iri na asa.

GWO NKA: Odi Nma Ichere Ma Mee Ihe Ejije Di Nma Ma Kwesi Ekwesi, Ka Shahid Kapoor Kwuru

Okacha Mara nakwa Aka ochie n’iti egwu bu Mazi Victor Uwaifo bu onye nwetagoro otutu Ihe nrite n’iti egwu abughi soso olu oma onwere ka eji mara ya kama ejikwa ifu opu,ikpo ubo osisi ,ubo akwara nakwa ngwa egwu ndi ozo di iche iche wee Mara ya. Ma burukwa onye na aruputa ufodu n’ime ngwa egwu ndia.

Eji egwu ndi dika Miami Water nakwa Joromi wee Mara Mazi Victor Uwaifo, Uwaifo ka nokwa n’akwalite ihe otutu dika onye nkuzi nakwa oka egwu obu.

Uwaifo bukwa onye ike ochichi etiti nyere nkwanye ugwu site n’ichi ya onye otu nke iwu Niger, (MEMBER OF THE ORDER OF THE NIGER-M.O.N),

Sir Victor Uwaifo bu onye isi nke otu Joromi bu ebe ana emeputa egwu ma ihe onyonyo di iche iche nke di na ime obodo Benin, onwekwara ulo ihe otutu na ihe akpurakpu di iche iche bu nke ona ahazi dika onye  isi ya.

Oburu na ichoro imatakwu banyere akukoa na ozi ndi yiri ya,ngwa sonyerem n’ikuku ma obu na oha into akukom,