Skip to content

ỤMỤADA IGBO AKPỌỌNA OKU MAKA ỊKWALITE ASỤSỤ NA OMENALA IGBO

Otu a kpọrọ ‘Ụmụada Igbo’, bụ otu jikọtara ụmụada Igbo niile ma ndi bi n’ala Naịjiria na mba ofesi akpọkuona ndi nne na nna na ụmụafọ Igbo niile maka ịkwalite asụsụ, njirimara na omenala Igbo, bụ nke na-anwụzị anwụ ugbu a.

Oku a dị oke mkpa bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ ndi otu a n’agba nke abụọ nke ọgbakọ izugbe ha, nke ahọ 2017.

Ka ọ na-ekwu okwu na ya bụ nnukwu ọgbakọ, bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ụka ‘St. Patrick’s Cathedral Awka’ na steeti Anambra; onye isi izugbe nke otu ahụ, ma n’ala Naịjiria na mba ofesi, bụ ‘Chief’ Dọkịnta Kate Ezeọfọr mere ka a mara na isi sekpụ ntị n’ihe e jiri hibe otu ahụ bụ ịzọpụta na ịkwalite ọnatarachi ndi Igbo, bụ nke na-anwụzị anwụ ugbu a, site n’ịchịkọba ọgbakọ dị iche iche maka ụmụakwụkwọ Igbo na ndi nne na nna; ichekwaba ikike dịịrị ụmụ nwaanyị, nakwa inyere ndi ụwa na-atụ n’ọnụ aka.

Ọ kpọrọ oku ka a malite ịkụnye ihe ndị a na ndụ ụmụ afọ Igbo site na nwata, ma sikwazie na e debanyego aha otu ahụ n’akwụkwọ na mba ‘United States’ nke Amerika.

O kelere Gọvanọ Willie Obianọ na nkwado ọchịchị ya na-enye otu ahụ, ma kpọkuziekwa ụmụ afọ ndị ọzọ selitere isi na ndi aka ji akụ ka kwado otu ahụ, dịka ihe e jiri wube ya bụ n’ihi ihe metụtara mmadụ, na ọdịmma nke ndị Igbo n’izugbe.

N’okwu nke ya, onye isi mmemme ahụ ma bụrụkwa onye isi izugbe nke Ohaneze Ndi Igbo, bụ ‘Chief’ Nnia Nwodo, toro ndị otu ahụ maka ezi nzọpụ ụkwụ ahụ ha zọpụrụ iji wechighata ebube na njirimara ndị Igbo, bụ nke funahịgoro ha, ma kwe nkwa nkwado nke Ohaneze Ndi Igbo nye otu ahụ.

Okwekwara nkwa ime ka ndị gọvanọ niile nke ndịda-ọwụwa anyanwụ mara maka ebumnobi nke otu ahụ, iji wee nwetewanye nkwado site n’aka ọchịchị ha, ma dụziekwa nne na nna igbo ọdụ ka ha na-ahụta ya dịka ọrụ dịịrị ha mgbe niile, bụ ịkụziri ụmụ ha asụsụ Igbo n’ihi na ọ bụ njirimara ha.

Ka ọ na-eme ka ụmụ nwaanyị mara ihe dị iche iche gbasaara ọnọdụ ahụ ike, otu onye ọrụ ahụ ike bụ Dọkịnta Richard Edeọnụ kwuru na ịtụ aro maka ezinaụlọ dị mkpa nye ezinaụlọ ọbụla n’ihi na ọ ga-eme ka ezinaụlọ ọbụla mụọ ụmụ ole ha ga-azụnwu nke ọma, ma n’agụm akwụkwọ ma n’ihe ndị ọzọ; ma sịkwazie na imesapụ ahụ bụ nnọ ụzọ kacha mma iji emeriṅọrịa kansa.

Dọkịnta Edeọnụ kọwara ọrịa kansa dịka ọrịa jọgburu onwe ya ma sịkwa na ọrịa kansa ara so na nke kacha éwü èwù. Ọ dụzịkwara ụmụ nwaanyị ka ha na-enyocha ara ha oge nille ma kọwatakwara onye dọkịnta ihe ọbụla gbara ha gharị n’ihi na ya bụ ọrịa na-adị mfe ọgwụgwọ ma a chọpụta ya n’oge.

Egwu ọdịnala ụmụada ahụ gụrụ na ihe ngosi ndi ọzọ so n’ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ.

SOURCE: Izunna Okafor