Skip to content

ỤMỤ NWANYị, NDị NTORỌBịA EMELA NGAGHARị IWE NA STEETI IMO GBASARA OSHIOMHOLE

Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụ nwanyị na ndị ntorọbịa nọrọ n’ụbọchị Mọnde mee ngagharị iwe na steeti Imo gbasara ka Oshiomhole si mee ntuliaka ime ụlọ na steeti ahụ.

Ha boro Oshiomhole ebubo maka ịgbanwe aha mmadu anọ bụkwa ndị nwetara mmeri na ntuliaka ime ụlọ e mere na steeti ahu.

Ndị a iwe jụrụ n’obi mere ngagharị iwe n’okporo ụzọ niile dị na ịsi ọchịchị steeti ahụ. Ha kwara arirị nyere ọchịchị aka ike nke Oshiomhole ma kpọkuo Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ka ọdụo ya ọdụ. Ha kwụrụ n’agwa Oshiomhole nwere ike ibute nsogbu na pati APC na steeti Imo.