Skip to content

ỤLỌIKPE CHỌRỌ KA ABARIBE KWỤỌ N100 MILLION N’IHI NNAMDI KANU

Ụlọikpe ụkwụ nọ n’Abuja agwala mmadụ atọ ndị ahụ nara Nnamdị Kanu n’aka ebe bụkwa nke Enyinnia Abaribe bụ otu n’ime ha ka kwụọ ụlọikpe ahụ N100 million n’otu n’otu maka akpọtaghị Nnamdi Kanu n’ụlọikpe.

Ọ bụ onye ọkaikpe bụ Binta Nyako kwụrụ nke a taa.

A na-ekpe Kanu ikpe maka ịkpa nkata ikewapụ n’ala bụ Naịjịria.

Kanụ gbapụrụ n’ala anyị mgbe ndị Soja wakporo ụlọ ya n’abalị ịrị na anọ nke ọnwa Sepụtemba 2017.

Onye ọkaikpe bụ Binta Nyako nyere ha ọnwa abụọ ịkwụnye egọ a n’ụlọakụ ụlọikpe ahu.