Skip to content

ỤLỌIKPE AKWỤSILA NLC IBIDO NFANYEAKA N’ỤKWỤ ỌZỌ

Ụlọikpe akwụsila òtù na-ahụ maka ndị ọrụ n’ala anyị bụ ‘Nigeria Labour Congress’ (NLC) ibido nfanyeaka n’ụkwụ bụkwa nke ha chọrọ ibido n’abalị ịsịị nke ọnwa a.

Ụlọikpe a kwuru na ọ bụrụ na-ahapu nfenyeaka n’ụkwụ a ka ọ gaa n’ihu na ọ ga-eme ka ala anyị tụfuo ọtụtụ akụnụba. Ha kwụkwara na ọ ga-eme ka ndị chọrọ ịga ụlọọgwụ nara ọgwụgwọ hapụ ịga.

Ndị ọrụ chọrọ ịmalite nfanyeaka n’ụkwụ ọzọ maka ụgwọ ọnwa ọhụrụ.

Ndọ ọrụ chọrọ ka ụgwọ ọnwa opekata mpe ha bụrụ pụkụ naịra ịrị atọ, mana ọchịchị etiti na ndị gọvanọ chọrọ ịkwụ ha pụkụ naịra ịrị abụọ na ise.