Skip to content

NDI ỤLỌ NZỤKỌ OMEIWU ETITI EYIGHARIALA MMEPE HA RUO OCTOBER 9

Ndị ụlọ nzụkọ omeiwu etiti eyigharịala mmepe ha bụkwa nke ha yiburu ga-abụ na September 25. Ha kwuru na ha ga-emepezi n’October 9.

Ọ bụ onye odeakwụkwọ nke ụlọ nzụkọ a bụ M. A. Sani-Omolori kwuru nke a n’ụbọchị Sunday ịzuụka a.

GUKWUO: AGỤPỤTALA OZU MMADỤ DỊ PỤKỤ NARI ABỤỌ NA IRI ABỤỌ NA ANỌ N’ỤGBỌ AHỤ KPỤRỤ NA TANZANIA

Maazị Omolori kwuru na nke a bụ iji nye pati dị iche iche ohere ime ntuliaka onye ọgaara (primary election). O gwakwara ndị omeiwu ka ha bido n’October 9, ma ya kụọ elekere ịrị nke ụtụtụ.