Skip to content

ỤJỌ UNU ANAGHị ATỤ M – FAYOSE GWARA EFCC

Aka na-achị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose bụkwa onye ọkwa ya dịka gọvanọ steeti ahụ ga-abịa na njedebe n’abalị ịrị na ise nke ọnwa a agwala ndị ‘Economic and Financial Crime Commission’ (EFCC) n’ụjọ ha anaghị atụ ya.

Fayose gwara EFCC ka ha chebiri ya n’abalị ịrị na ịsịị nke ọnwa a ma ọkụọ elekere mbụ nke ehihie.

GUKWUO: NYE NDỊ ỌRỤ UGBO IDE MMịRị MEBIRI UGBO HA EGO ITI AKA N’OBI – EZE ONYIA

Fayose kwuru nke a na Wenezdee mgbe ọ na-agbahe ụlọakwụkwọ ọ rụrụ na Afao-Ekiti. O jikwa ohere ahụ gwa ndị ọrụ nọ na steeti ahụ ka ha gaa nara onye gọvanọ ọhụu n’abịanụ bụ Kayode Fayemi ụgwọ ọnwa eji ha.

O kwuru na ego ya gaara eji kwụo ha ụgwọ ọnwa ka ọchịchị etiti jichịrị. Ọ gakwara n’ihu gwa ọhanaeze gbakọrọ n’ebe ahụ na-enweghị mgbe ọ bụla ya gbazịrị ego iji rụọ ihe ndị ya rụrụ na steeti ahụ.