Onyeisi òtù ‘Indigenous People of Biafra’ (IPOB), bụ maazị Nnamdị Kanu agwala ndị ọrụ nọ n’ala anyị ka ha sonye ndị IPOB site n’ihapụ isonye na ntuliaka elu nke a ga-eme n’afọ 2019.
Kanu kwụrụ nke a n’ụbọchị Sọnde mgbe ọ na-ezigara mba ụwa ozi site n’obodo Israel. Ọ gwara ha ka ha kwụdosie ike ma hapu isonye na ntuliaka elu nke afọ ọzọ.
GUKWUO: ASUU EBIDOLA NFANYEAKA N’ỤKWỤ
Ọ gakwara n’ihu gwa ndị ọrụ na ọchịchị etiti ga-emejuputa ihe ha chọro ma ọ bụrụ na ha ajụ isonye na ntuliaka ahụ.
Ọ rịọrọ òtù jikorọ ndị ọrụ dị iche iche n’ala anyị ka ha sonyere IPOB na n’ịgbasa ozi megide isonye na ntuliaka elu nke afọ 2019.
O kwụkwara na-enweghị ihe ọ bụla ga-ekewa IPOB.