Skip to content

ỤGWỌ ỌNWA ỌHỤRỤ: ỌCHịCHị ETITI NA-ACHỌ ỊKWỤ NDỊ ỌRỤ PỤKỤ NAỊRA ịRị ABỤỌ NA ANỌ

Ọchịchị etiti n’ekwu na ha na-atụle ịkwụ ndị ọrụ pụkụ naịra ịrị abụọ na anọ. Nke a bụ dịka ha mecharala nzụkọ ha gbasara ụgwọ ọnwa ọhụrụ.

Ọ bụ onye minista na-ahụ maka ndị ọrụ n’ala anyị bụ Chris Ngige kwuru nke a n’ụbọchị Wednezdee.

GUKWUO: ANYị ACHỌGHị ỌKWA OSOTE ONYEISIALA, NYE ANYị ‘REFERENDUM’ – IPOB

Ngige gara n’ihu kwuo na ọchịchị etiti na ndị gọvanọ ịrị atọ na ịsịị dị n’ala anyị enweela mkparịta ụka. N’okwu ya “Mgbe anyị na ndị steeti gọvanọ nwechara mkparịta, ọchịchị etiti kwenyere ịkwụ pụkụ naịra ịrị abụọ na anọ, n’ebe ọchịchị steeti kwetara ịkwụ pụkụ naịra ịrị abụo.

Ngige kwukwara na mkparịta ụka ka na-aga n’ihu.