Skip to content

UGWỌ ỌNWA ỌHỤRỤ: NDI ỌRỤ GA-EBIDO ABUBỌNU NA SEPTEMBER 26

Otu na-ahụ maka ndi ọrụ n’ala anyị bụ ‘Nigerian Labour Congress” (NLC) ma abalị ịrị na anọ ha nyere ọchịchị etiti gbasara ụgwọ ọnwa ọhụrụ gwụcha.

GUKWUO: URU IṄỤ MMỊRỊ BARA NA NDỤ MMADỤ

Onyeisi otu a bụ Maazị Ayuba Wabba kwuru nke a n’Abuja na Wenezdee.

Ayuba kwuru na abụbọnụ a ga-adị mkpa ọ bụrụ na ọchịchị etiti emejupụtaghị ihe ha na-achọ.

Anyị ga-echeta na ndị ọrụ nyere ọchịchị etiti mkpụrụ ụbọchị ịrị na anọ iji mejuputa ihe ha chọrọ bụkwa nke bidoro n’abalị ịrị na abụọ nke ọnwa a anyị nọ n’ime ya.