Skip to content

TAA KA ELIRI NWUNYE RAS KIMONO BỤ EFE OKEDI

A nọrọ n’ụbọchị taa lịe nwunye Ras Kimono bụ Efemena Okedi n’ebe a na-elị ozu dị na Yaba, Lagos.

Okedi bụ onye na-ahụ maka egwu Ras Kimono tupu ha abụọ alaa ala mụọ.

Ọ nwụrụ na abalị ịrị abụọ na atọ nke ọnwa ịtolu n’afọ a n’otu ụlọ ọgwụ dị na Legọs.

GUKWUO: NDị AGHA ALA ANYị KA JI ASAMBODO M, BUHARI GWARA INEC

Onye ụkọchukwu kwụrụ okwu chukwu n’olili ozu ahụ bụ Emmanuel Ajomafuwe kọwara Efe dịka nwaanyị ihunanya ma gwa ndị mmadụ ka ha nye chukwu ekele maka ezigbo ndu nwaanyị ahụ bịrị.

Ọ kọwara ọnwụ dịka ihe nketa dịịrị onye ọ bụla.

Okedi bụ nwunye Ras Kimono nke atọ.

 

NAN