Skip to content

Stephanie Frappart ga-egbu bọọlụ Chelsea na Liverpool

 

STEPHANIE FRAPPART

Stephanie Frappart bụ nwaanyị mbụ ga-egburu UEFA bọọlụ ụmụ nwoke. Ọ bụ ya ga-egbu bọọlụ Super Cup bụkwa nke ga-adị n’etiti Chelsea na Liverpool n’Istanbul n’abalị iri na anọ nke ọnwa a.

Nwaanyị a gbara afọ iri atọ na ise bụ ya gburu bọọlụ ikpeazụ dịịrị n’etiti mba Amerịka na Netherland n’iko mba ụwa nke ụmụnwaanyị n’obodo ya bụ France.

Ọ rụọla ọrụ na League 1, n’ebe aha ya sokwa na ndị ga-egbu bọọlụ nke afọ a. Onyeisi òtù UEFA bụ Roberto Rosetti kwuru na obi dị ya ụtọ maka nhọpụta ahọpụtara Frappart.