Ọchịchị steeti Legọs nọrọ n’ụbochị taa (Wednezde) gwa ndị mmadụ na iwu bụkwa nke ga akwado ibido nzacha na mkpocha a na-eme ọnwa niile ga-ebido n’oge n’adịghị anya.
Ọ bụ onye Kọmishịona na-ahụ maka ogbe na mmiri bụ Maazi Tunji Bello kwupụtara nke a mgbe ya na ndị “Association of Commodity Market Women and Men” nwere ọgbakọ bụkwa nke onyeisi ha bụ Iyaoja Folasade Tinubu-Ojo kpọ ha bịa.
Bello kwuru na iwu ụlọikpe nyere banyere nzacha na mkpocha n’oge gara aga bụ otu ihe kpụlara ya bu ihe azụ, bụkwa nke ga-ebidokwa ọzọ n’oge n’adịghị anya.