Skip to content

RONALDO ASUNYELE GOOLỤ MBỤ YA N’OTU EGWU BỌỌLỤ JUVENTUS

Cristiano Ronaldo sunyere ọkpụ goolu abụọ na mmeri ha nwetara n’ụbọchị Sọnde mgbe ha na ndị otu egwu bọọlụ Sassuolo kwakọtara mgbọ.

Nke a bụ goolụ mbụ Ronaldo na-asunyere otu egwu bọọlụ ọhụrụ ya bụ Juventus. Nwamadị a sunyere goolụ a mgbe ha na ndị otu egbu Sassuolo zutere n’ebe ha na-agba bọọlụ dị na Turin.

Gukwuoo: OMISORE CHỌRỌ KA ỌCHỊCHỊ ETITI CHỌPỤTA NDỊ GBỤRỤ BOLA IGE

Ronaldo sunyere goolu nke mbụ na nkeji irị ise, ma sunyekwa nke abụọ na nkeji ịrị asaa na ise. Khouma Babacar bụ onye na-agbara otu egbu bọọlụ Sassuolo sunyere otu goolụ mgbe ọ fọdụrụ nkeji atọ ka egwuregwu bọọlụ ahụ bịa na njedebe.

N’ikpeazụ, otu egbụ bọọlụ Juventus nwetera mmeri. Ndị na-akwado otu egwu bọọlụ ahụ ka aṅụrị jụrụ obi n’ịhị otela anya ha na-atụ anya nke a.