Skip to content

NDỊ IGBO BI NA REGINA, KANADA, EMENA MMEMME “UBOCHỊ NDỊ IGBO” NKE AFỌ 2017

NDỊ IGBO BI NA REGINA, KANADA, EMENA MMEMME “UBOCHỊ NDỊ IGBO” NKE AFỌ 2017

Ụmụ afọ ala Igbo ndi bi na Regina, isi obodo prọvịnsụ Saskachịwan, di na mpaghara ọdịda anyanwụ mba Kanada, emena oke mmemme pụrụ iche nke e jiri mara ndị Igbo, nke ha kpọrọ “Ụbọchị Ndị Igbo,” agba nke afọ 2017.

Ha na-eme mmemme a n’afọ abụọ ọbụna. Mgbe ọzọ ha ga-eme Ụbọchị Ndị Igbo ga-awụ n’afọ 2019.

Ọtụtụ ụmụ afọ Igbo si mpaghara Kanada dị iche iche juputere na Regina maka mmemme Ụbọchị Ndị Igbo ahu e mere n’abalị 26 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2017. Ndị bịara mmemme ahụ gụnyere ndị Igbo bi na Winnipeg, Saskatoon, Prince Albert na mpaghara Kanada ndị ọzọ.

Ọtụtụ ndị mba ọzọ ndị ha na ndị Igbo bi na Regina na-emekọrịta ịhe, ndị Yoroba, ndị Ghana, ndị Uganda na ndị ọcha mba Kanada, sonyekwere na mmemme ahụ.

Onye ọbụna bịara ebe ahụ rijuru afọ ya, taratụ ụgba, ma nụrụkwa mmanya.

Mgbe onye isi otu jikọrọ ndị Igbo na prọvịnsụ Saskachịwan, bụ Maazị Henry Nwadike, weere igwe mgbasa ozi korofonu, o kelere mmadụ niile siri ebe dị iche iche bịa na Regina maka mmemme ahụ.

Ọ rịọrọ Chineke maka ndụ ndị Igbo, udo na ịdị n’otu, ma na Naịjirịa, ma n’ebe ndị ọzọ. O kwuru na ndị Igbo na Regina nwere atụmatụ iwu ụlọ nzukọ obi ndị Igbo na Regina.

Ichọrọ imatakwu ka osiri gaa soro anyi n’ọha nta akụkọ anyi bụ: www.isimbido.tv

Source: IgboRadio.