Skip to content

POGBA GA-AHAPỤRIRI MANCHESTER UNITED NA JENUARị – INCE

Onye gbaburu otu egwu bọọlụ Manchester United bọọlụ n’oge gara bụ Paul Ince ekwuola na Paul Pogba ga-ahapụrirị otu egwu bọọlụ a n’ọnwa mbụ n’afọ ọzọ.  Nke a bụ n’ihi nsogbu dị n’etiti ya na onyeisi nchịkọta egwu bọọlụ a bụ Jose Mourinho.

GUKWUO: NDI UWEOJII ANWỤCHIELA OTU NWOKE CHỌRỌ IGBU ATIKU ABUBAKAR

Ince gara n’ihu kwuo na Mourinho ekpebiela ire Pogba n’ihi nsogbu ya nyeere otu egwu boọlụ ahụ nakwa ka o si akatọ Mourinho.

Ince kwukwara na ndị isi otu egwu bọọlu a ga-adọnyere Mourinho ukwu n’ihi na-enweghị onye ọ bụla karịrị Manchester United.