Skip to content

PDP NA-ACHỌ KA AMBODE NA NDị ÒTÙ APC NDị ỌZỌ BATA NA PATI HA

Ndị òtù pati ‘Peoples Democratic Party’ (PDP) na steeti Legọs na-akpọ Akinwunmi Ambode na ndị òtù pati APC ndị ọzọ ka ha bata na pati ha ịjị nye aka napụta steeti Legọs n’aka otu onye.

Onye na ekwuchitere PDP ọnụ na Legọs bụ Maazị Taofiq Gani n’ozi ya rịọrọ ndị APC iwe n’ewe ka ha hapụ APC ma bata na pati ha ịjị mee ka steeti Legọs gaa n’ihụ. Ọ gwara ha ka ha gbasoro ụkpụrụ ndị otu ha nọ na steeti Ogun, Oyo, Kaduna, Imo, nakwa ndị ọzọ.

PDP kwụrụ na ha dị njikere ịnabata Ambode ma ọ bụrụ na ọchọọ ịhapụ APC.

PDP gara n’ihu kwuo na APC gbochịrị ọtụtụ ndị òtù ha ịlọghachị nke ụgboro abụọ n’ọchịchị. PDP rịọrọ ndị dị otu a ka kwunyere PDP ịjị nye aka mee ka steeti Legọs nweere onwe ya site n’aka otu onye.