Skip to content

PDP EMEPELA IHE ONYONYO TV MAKA NTULIAKA ELU NKE AFỌ 2019  

Òtù pati PDP emepela ihe onyonyo TV ọhụrụ aha ya bụ ‘Legacy TV’ maka ntuliaka onyeisiala a ga-eme na afọ 2019.

Ọ bụ onyeisioche pati a n’ala anyị bụ Uche Secondus kwụpụtara nke a site n’igwe nzirịta ozi ọlọrọ ọhụrụ ha bụ twitter.

O kwụrụ na nke a ga-enyere ha aka maka ịchụ nta vootu maka ntuliaka onyeisiala a ga-eme n’afọ ọzọ.