Skip to content

AGỤPỤTALA OZU MMADỤ DỊ PỤKỤ NARI ABỤỌ NA IRI ABỤỌ NA ANỌ N’ỤGBỌ AHỤ KPỤRỤ NA TANZANIA

Agụputala ozu mmadụ dị puku nari abuo na ịrị abụọ na anọ n’ọnụ ọgụgụ n’ụgbọ ahụ kpuru na Lake Victoria nke dị na mba Tanzania bụkwa nke mere n’ụbọchị Tọzdee izụụka gara aga.

Ọ bụ onye minista na-ahụ maka ọrụ na nzirita ozi bụ  Isack Kamwel kwuru nke a mgbe a na-eli mmadụ ịrị nwụrụ site na njinji ahụ.

GUKWUO: NYE ANYỊ ỌKWA OSOTE ONYEISIALA MAỌBỤ CHEFUO ITUNYERE ỤNỤ VOTU – ỌHANAEZE ‘YOUTHS’ GWARA PDP

Onye minista gakwara n’ihu kwuo na ụgbọ ahụ kpụrụ n’mmịrị bu mmadụ karịrị ihe ụgbọ ahụ kwesiri ibu.

Maazi Kamwele kwuru na n’ime ozu dị puku narị abụọ na itolu, bụkwa ndi a chọputarala ndị ha bụ, ndị ezinaụlọ nwe ozu ndị a eburule ozu dị puku narị abụọ na ịrị na anọ n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha maka ili ha.

Maazị Kamwele mere ka amata na ha anatala ihe onyinye ego di puku dọla asatọ na abụọ bụkwa nke ndị mmadụ nyere iji nye aka ịzọputa ndị mmadụ na njinji ahụ jirinu.