Skip to content

OYETOLA ENWETALA MMERI NA NTULIAKA EMERE NA STEETI OSUN

Òtù na-ahụ maka ntuliaka elu n’ala anyị bụ ‘Independent Electoral Commission’ (INEC), ekwuola na Isiaka Oyetola bụkwa onye ji aha òtù pati APC dọọ ọkwa aka na-achị steeti Osun nwetara mmeri na ntuliaka emere na steeti ahụ.

GUKWUO: AKA MGBA NDI CHEERE AMBODE DIKA APC GA-EME NTỤLIAKA ONYE ỌGAARA NA SATỌDEE

Joseph Afuwape kwuru nke a n’abalị Tọzdee n’Osogbo mgbe ha mechara mmegharị ntuliaka ahụ.

PDP n’aka nke ya ajụla ịnabata rezọtụ ahụ. PDP kwuru na mmegharị ntuliaka ahụ e mere n’ụbọchị Tọzdee jụputara na nrụrụaka, mmegide ndị òtù ha nakwa ịzu vootụ. Ha ekpebiela ịga ụlọikpe maka nke a.