Skip to content

ISI OKWU: Kwusi Imunye Oku N’OGbaghara”, Ndi Otu South-South N’enye Wike Ndumodu

ISI OKWU: Kwusi Imunye Oku N’OGbaghara”, Ndi Otu South-South N’enye Wike Ndumodu

Onye ndu otu ndoro ndoro ochichi ndi south-south odozi aku Ibifuro Tatua n’izuka a nyere govano Nyesom Wike ndomodu onye nke n’achi obodo Rivers ka okwusi imunye oku n’ogbaghara di na ndoro ndoro ochichi site n’okwu onu ya.

Odozi Aku Tatua gwara ndi nta akuko n’obodo Port Harcourt, n’okwu onu Wike adighi ka nke onye bu govano.

BOB-MANUEL UDOKWU NA AKPO NDI-IGBO N’ILE KA’HA LOTA ULO

Tatua nyere Ndumodu ka olekwasi anya n’ochichi nke obodo Rivers, na kwa oga n’ihu ma hapu iwe n’ekworo ona enwe n’ebe onye n’ahu maka ugbo ala n’obodo Nigeria ma burukwa onye chiburu ododo Rivers bu Mazi Chibuike Amaechi.

Tatua siri ndi obodo Rivers ka ha n’elegara Wike anya k’obido ebe Amaechi kwusiri ka udo wee chia n’obodo Rivers.

Tatua kwuru govano Wike wedara onwe ya ala n’iko akuko ifo ya na igbasa nkpuru adighi n’udo nke ga eme ya k’ohapu ibu ezigbo onye ana elegara anya n’obodo Rivers.Tatua burukwara akpa ekele bugara onye chiburu obodo Bayelsa, Chief Timiprie Sylva onye nke mere ncheta omumu ya n’afo iri ise n’ato ogbara, ma gbaa ya ume ka ogaa n’ihu imeka ndu diri ndi nmadu Nma.

Isi Mbido TV na ekelekwa Sylva, na ncheta omumu ya, n’agwakwa ya ka o jisie ike ihu na obodo Bayelsa nwere ogan’ihu dika onye ndu.

SUGGESTED VIDEO AT THE TOP: