Skip to content

OTU NWA AKWỤKWỌ AKWỤOLA ỤDỌ NA STEETI ANAMBRA

Otu nwa akwụkwọ gbara afọ ịrị abụọ na itolu aha ya bụ Philip Chinedu bụkwa onye na-agụ akwụkwọ n’ Nwafor-Orizu College of Education, Nsugbe, akwụọla ụdọ n’ihi ụgwọ akwụkwọ lara elu.

GUKWUO: NYE ANYỊ ỌKWA OSOTE ONYEISIALA MAỌBỤ CHEFUO ITUNYERE ỤNỤ VOTU – ỌHANAEZE ‘YOUTHS’ GWARA PDP

Nwa akwụkwọ a gbụrụ onwe ya bụ onye Eziowelle nke dị n’Idemili North, bụkwa onye nọ n’afọ nke abụọ ya n’ụlọakwụkwọ ahụ. Onwụ nwa akwukwọ bụ nke ka na-agba ụmụ akwụkwọ nakwa ndị nkụzi nke ụlọakwụkwọ ahụ anya gharịị.

Akụkọ kwuru na tupu Chinedu akwụọ ụdọ, e mere mkpesa gbara ka ndị ụlọakwụkwọ ya si bulie ugwọ akwụkwọ ha.

Onye uweojii naahụ maka mmekọrita ndị mmadụ na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru na ha anatago ozi gbasara ihe merenu. O kwukwara na ozu nwa akwụkwọ ahụ ka ebugarala n’ebe a na-edewe ndị nwuru anwụ.

Haruna kwuru na ha ka na-eme nghọcha iji mata ihe kpatara onwụ ya.