Skip to content

OSINBAJO EBELATALA ỌNỤ EGO E JI EDENYE AHA EJI EME AZỤMAHịA N’AKWỤKWỌ

Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ebelatala ọnụ ego eji edenye aha eji eme azụmahịa n’akwụkwọ. Osote Onyeisiala kwuru na n’ime mkpụrụ abalị ịrị itolụ na-abịanụ, na a ga-ejizi pụkụ naịra ise edenye aha e ji eme azụmahịa n’akwụkwọ karị puku naịra ịrị a na-anabụ.

GUKWUO: SANWO-OLU EKELELA TINUBU, OSHIOMHOLE MAKA NKWADO HA NA MMERI O NWETARA N’ỤBỌCHị TỤZDEEỌ bụ onye enyemaka osote Onyeisiala n’ihe gbasara nzirịta ozi bụ Maazị Laolu Akande kwuru na Osinbanjo kwuru nke a n’Enugu.

Osinbajo kwuru na nke a ga-ebido site n’abalị mbụ nke ọnwa ịrị ruo n’abalị ịrị atọ na otu nke ọnwa ịrị na abụọ n’afọ a. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ya mere nke a iji mee ka idenye aha eji azụ ahịa diri azụmahịa ndị ka n’eto eto mfe n’ala anyị.