Skip to content

ONYEISIALA EKWEGHACHILA NDI ỌRỤ NKWA N’IHE GBASARA ỤGWỌ ỌNWA ỌHỤRỤ

Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari ekweghachila ndị ọrụ nkwa njikere ya itinyekwụ ego n’ụgwọ ọnwa ndị ọru.

Ọ bụ onye enyemaka onyeisiala n’ihe gbasara ihe na-eme n’ụlọ nnọchita anya bụ  Ita Enang kwuru nke a.

Gukwuo: NDỊ OTU NZUZO EWETALA ỌGBAGHARA N’OLILI OZU ONYE OTU HA NA STEETI BAUCHI

Onyeisioche na-ahụ maka ndị ọrụ n’ala anyị (NLC) bụ Maazi Ayuba Wabba  ekwuola na-ọchịchị etiti na apụghachị usoro Ịkwụ ndị ọrụ ugwọ ọnwa ọhụrụ azụ.

Maazi Ayuba kwuru na ya na ndị ngalaba ndị ọzọ ga-enwe nzụkọ n’ịzụ ụka ọzọ iji mara ihe ọzọ ha ga-eme.