Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari ekweghachila ndị ọrụ nkwa njikere ya itinyekwụ ego n’ụgwọ ọnwa ndị ọru.
Ọ bụ onye enyemaka onyeisiala n’ihe gbasara ihe na-eme n’ụlọ nnọchita anya bụ Ita Enang kwuru nke a.
Gukwuo: NDỊ OTU NZUZO EWETALA ỌGBAGHARA N’OLILI OZU ONYE OTU HA NA STEETI BAUCHI
Onyeisioche na-ahụ maka ndị ọrụ n’ala anyị (NLC) bụ Maazi Ayuba Wabba ekwuola na-ọchịchị etiti na apụghachị usoro Ịkwụ ndị ọrụ ugwọ ọnwa ọhụrụ azụ.
Maazi Ayuba kwuru na ya na ndị ngalaba ndị ọzọ ga-enwe nzụkọ n’ịzụ ụka ọzọ iji mara ihe ọzọ ha ga-eme.