Skip to content

ONYEISIALA EZIGARALA APC NA OYETOLA OZI EKELE MAKA MMERI HA NWETARA NA NTULIAKA

Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari bụkwa onye ka nọ na mba New York ezigarala ozi ekele ya nye APC nakwa onye gọvanọ ọhụrụ ahọpụtara bụ Isiaka Oyetola maka mmeri ha nwetara na ntuliaka elu emere na steeti ahụ.

Ọ bụ onye na-ekwuchitere ya ọnụ bụ Garba Shehu kwupụtara nke a na igwe nzirịta ozi ọlọrọ ọhụụ bụ Twitter.

GUKWUO: OYETOLA ENWETALA MMERI NA NTULIAKA EMERE NA STEETI OSUN

Onyeisiala jịkwa ohere ahụ keele ndị niile gbara mbọ iji hụ na APC meriri na ntụliaka ahụ. O kelekwara aka na-achị steeti ahụ bụ Rauf Aregbesola maka ọrụ ya niile nakwa mbọ ya kamgbe ọ na-achi steeti Osun.

Buhari gwara Oyetola ka ọmata na ndị Osun na-atụ anya ọtụtụ ihe n’aka ya, ka omee ka ọchịchị onye kwụo uche ya rụte ebe ọ bụla na steeti ahụ.

Onyeisiala kelere ndị niile so zọọ okwa gọvanọ na steeti ahụ maka itinye ike ha niile ma gwa ha ka ha gaa ụlọikpe ma ọ bụrụ na ha anabataghị ka okwe si gbaa.