Skip to content

Onye agha ịyi egwu egbuona mmadụ asatọ na New York

Onye agha ịyi egwu egbuona mmadụ asatọ na New York

O peka mpe, mmadụ asatọ anwụọna, ebe ịhe karịrị mmadụ iri na abụọ merụrụ ahụ na Manhattan, na New York.

Ndị hụrụ mgbe o mere gwara ndị nta akụkọ n’otu nwoke onye agha iyi egwu jiri ụgbọ ala ya mere mgbọ. Ọ na-anya aghara aghara n’okporo ụzọ, n’etiti obodo, n’ehihe ọcha.

Ọ malitere na-akụtu ndị mmadụ, ma ndị ji ụkwụ aga, ma ndị igwe, ma ndị ụgbọ ala ibe ya.

Mgbe nwoke ahụ na-akpa mkpamkpa ahụ, ọ na-eti mkpu n’olu ike, na-asị “Allahu Akbar.”

Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu maka nke a, onye Meyọ New York, bụ Bill de Blazio, kwuru sị na ihe a bu agha iyi egwu megide mba Amerịka.