Skip to content

OMISORE ADỌNYERALA APC ỤKWỤ KA HA NWETA MMERI N’ỤBỌCHI TỌZDE

Sen. Iyiola Omisore ekwela nkwa ime ka otu pati APC nweta mmerị na mmeghari ntuliaka ahụ a ga-eme na steeti Osun n’ụbọchị Tọzde.

GUKWUO: IDE MMIRI EGBUOLA NWA NỌ AFỌ ITOLỤ N’ANAMBRA STEETI

Omisore kwuputara nke a n’ụbọchị Wednezdee mgbe ya na ndị ndu APC bụkwa nke onyeisioche ha n’ala anyị bụ Adams Oshomhole nwere nzụkọ. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ya ga-agbalị ike ya iji mee ka onye na-ọzọ ọkwa gọvanọ n’otu pati APC bụ Gboyega Oyetola nwetara mmeri na mmegharị ntuliaka a ga-eme na steeti ahụ na Tọzdee.

Mmegharị ntuliaka a bụ nke ga egosi onye ga-achị steeti ahụ dịka gọvanọ.