Skip to content

OKOROCHA NA UCHE NWOSU EMERIELA NA NTULIAKA ONYE ỌGAARA NKE APC MERE

Aka na-achị steeti Imo bụ Rochas Okorocha enwetala mmeri dịka onye ga-anọchite ọgbọnta vootu  Imo West n’ụlọ nnọchite anya.

Ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu n’aka nke ya enwetala mmeri dịka onye ga-eji aha òtù pati APC dọọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka a ga-eme n’afọ ọzọ.

GUKWUO: UKACHUKWU EMERIELA BIANCA OJUKWU NA NTULUAKA ONYE ỌGAARA NKE APGA MERE

Hope Uzodimma na Eze Madumere ekwuola na ha esoghị na ntuliaka ahụ. Ha kwuru na ha gara ụlọikpe ikwụsi ntuliaka ahụ,

Anyị ga-echeta na Hope Uzodimma meriri na ntuliaka onye ọgaara nke mbụ ndị pati APC mere na steeti ahụ, mana Okorocha na ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu anabataghị ya bụkwa nke mere ha jị megharịa ọzọ.