Skip to content

Okorocha Machiri Ndi Ochi-chi Omenala Iji Asusu Bekee Eme Ogbako.

Okorocha-Rochas-imo-state-isimbido-tv

Okorocha Machiri Ndi Ochi-chi Omenala Iji Asusu Bekee Eme Ogbako.

Gere nu akuko anyi na uju ya.

Aka n’achi obodo Imo bu Rochas Okorocha machiri ndi ochi-chi omenala iji asusu bekee eme ogbako.

Asusu bekee bu asusu ana asu n’ogbako jikoro obodo Nigeria niile, mana obughi asusu ana asu n’ogbako ime obodo nke nwa-afor igbo.

Okorocha nyere ndi isi omenala iwu ka ha kwusi iji asusu bekee eme ogbako iji gosi n’obughi asusu eji mara ezigbo nwa-afor igbo toro n’ala nnaya.

Onye isi ochi chi nke obodo Imo bu Rochas Okorocha asuola ya dika ofor n’obu ihe aru ndi ochi chi ime obodo n’ndi nke omenala ina eji asusu bekee eme ogbako n’ala Imo niile.

Onye isi ochi-chi obodo Imo bu Okorocha nyere iwua mgbe ona eme-emume nke inyefe okwa oru ma obu ike ochi-chi ya n’asambodo oru n’aka onye amara dika onye isi ndi eze nke iri n’itoolu n’obodo Imo, nke a n’eme owerri n’isi ulo obodo Imo n’izu-ukaa.

Okorocha siri n’ndi ochi-chi ime obodo n’ndi isi omenala ga n’eme ogbako ha n’asusu Igbo ma obu chota onye nkowa okwu n’olu bekee n’ebe odi nkpa.

IsiMbido TV si n’oga amasi ha n’ndi isi ochi-chi obodo ndi ozo di n’ala Igbo ga eme dika onye isi ochi-chi obodo Imo bu Rochas Okorocha, oga enye aka k’asusu Igbo gbaa ngborogwu ma burukwa ihe ga-amasi umu anyi ina-asu mgbe obula.

Biko nu nonyere m n’oge a n’izuka ozo n’otu ebe a isimbido.tv, udo diri nu niile, ka emesia nu.