Skip to content

OKE AWAKPONA ỤLỌ ỌRỤ BUHARỊ

OKE AWAKPONA ỤLỌ ỌRỤ BUHARỊ

Dịka a sị na chi na-efo, ihe ọhụụ ana-apụtawanye; ozi na-erute anyị ntị na-akọwa na òké (rat) awakpona ụlọ ọrụ onye isi ala anyị bụ Muhammad Buharị ma mebisiekwa ọtụtụ ihe ebe ahụ.

Nke a dị n’ozi a kụpụụrụ ndi nta akụkọ site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye onye isi ala n’ịgbasa ozi, bụ maazị Shehu Garba n’Abụja, ụbọchi Tuzdee.

Maazị Garba sịrị na ya bụ òké arụrụ ala mebisiri nnọọ nnukwu ihe n’ụlọ ọrụ ahụ, nke gụnyere igwe ntụ oyi, bụ ‘air conditioner’ Buharị ji arụ ọrụ, na ọtụtụ ihe ndi ọzọ. Ọ kwuru na ọ bụ oge onye isi ala nọ na mba London anara ọgwụgwọ ka oke ndị ahụ mịbatarasịrị wee kụọ ya bụ akụmakụ, ma jide ihe niile mebisie.

O kwukwazịrị na n’ihi nke ahụ, na onye isi ala ka ga-anọgodi n’ụlọ weeṅna-arụ ọrụ, rukwaa mgbe e dozichara ihe ndị ahụ òké mebisiri.

Ichọrọ imatakwu ka osiri gaa soro anyi n’ọha nta akụkọ anyi bụ: www.isimbido.tv

SOURCE: IGBO RADIO