Skip to content

OGBAGHARA AGBATAOBI; NDIGBO BI NA CROSS RIVER N’ARIO ENYEMEK-AKA

Ndi’gbo bi n’obodo Cross River n’ario ka enyere ha aka, aririo a ka ha mere mgbe ha biara ileta umunne ha ndi bi n’ime obodo Uyanga na Ojor di na Akamkpa local government area na obodo Cross River, onye nta akuko anyi bu De Baptist si na ufodu ndi tufuru ndu ha na aku di iche iche mgbe ogu agbataobi ahu kpoturu n’mpaghara ahu.

Onye isi ndi igbo n’obodo Cross River, Dr Lawrence Chukwuemeka, onye kwuru okwu n’ulo onye isi ndi ichie di n’ime obodo Uyanga, Ophot Felix Akposi, gosiri ka obi di ya njo gbasara ihe a mere.
Onye nta akuko anyi bu Mazi De Baptist onye n’agwa anyi ka osi gbatakwuru n’ebe ahu siri na Mazi Chukwuemeka si mgbe obula enwere nsogbu n’obodo Crosss River ndi igbo bu ndi ana-alusa ogu, ma ndi ime obodo abuo ahu n’ese okwu ga ahapu onwe ha, ma gaa meruwa ma mebiwa ihe ndi igbo, Chukwuemeka si n’ihea bu ihe jogburu udele n’njo ma sigbue nkapi n’isi.

Dr Lawrence si mgbe obula ndi igbo n’aburu ha ewu di iche iche eji chuo aja, oge obula ime obodo abuo nwere ogbaghara, asikwarii n’ogbaghara ahu agbasaghi ndi igbo ha ga emebiriri ihe ndi igbo.

Dr Lawrence si mgbe na etebeghi aka ka anyi guru n’akwukwo nta akuko gbasara ime obodo abuo–Akamkpa Uyanga na Ojor nwere ogbaghara, ma mgbe mkpotu na ogu ahu  kwusiri, ihe anyi nuru bu ndi igbo bu ndi emekpara ahu, merukwa ahu, ma mebikwa ihe kariri iri ato (30) onodu izu ahia ha di iche iche, ebe ofodu tufuru ndu ha.

Ophot Akposi bu onye isi ndi ichie si na tigbuo na zogbuo ndia abughi ndi obodo Cross River na eme ya, okwere nkwa na ya na ndi Emergency Agency nke obodo Cross River (SEMA) na ndi National Emergency Management Agency (NEMA) ga enwe ogbako, ma hu na enyema-aka ga erute ndi mmadu ebe ha n’azu ahia bu ihe akwaturu, ma ndi tufuru ndu ha.

Nta akuko a n’abiara gi site n’ngalaba oba akuko n’isimbido tv.
Ichoro imata nke oma gaa n’isimbido.tv