Skip to content

Odi Nma Ichere Ma Mee Ihe Ejije Di Nma Ma Kwesi Ekwesi, Ka Shahid Kapoor Kwuru

bollywood-akukwo-india-ejije

Odi Nma Ichere Ma Mee Ihe Ejije Di Nma Ma Kwesi Ekwesi, Ka Shahid Kapoor Kwuru

Onye amaara amara na ime ihe ejije  nke mba India (BOLLYWOOD) bu Shahid Kapoor kwuru na ewepu oru nke oji na aka ugbua bu nke akporo Padmavati, oteela aka oputadebere na ihe onyonyoo, ma onaghi ewute ya ma obu na eche ya uche ma olii ,n’ihi n’obu mgbe onye n’eme ihe ejije na adighi nma ka oga na enwe nwute.

 Odi nma ichere ma mee ihe ejije di nma ka okwuru, wee si na ya choziri I na eme ihe ejije ndi na akuzi ihe ma na emekwa obi uto.

Sanjay leela bhansali bu onye nwe ihe ejije akporo Padmavati nke ona  eme ugbua nwerekwara ndi ozo so na ya bu ndi gunyere, Deepika Padukone na Ranveer Singh,.

GWO NKA: Okorocha Machiri Ndi Ochi-chi Omenala Iji Asusu Bekee Eme Ogbako.

  Okwuru na ya ekwesighi ikwu otutu ihe gbasara ya bu ihe ejije, ma naani ihe oma bu ya bu ihe ejije nwere ndi aka ochie n’ime ya, burukwa nke kwesiri ma burukwa opuru uche, okwuru na obi di ya uto iso na ya bu oru ma n’ekwe nkwa na oga aputariri n’ahia n’ime onwa iri na otu Novemba.

Ka osinadi Bhansali bu onye nwe ihe ejije nke ona eme ugbua kwuru na Shahid ga esoriri na nke ozo ona akwado ime ngwa ngwa omechapuru Padmavati bu nke okporo Tusdee Nile na Furaidee Nile bu akuko ihunanya.

  Onugo ma guo maka ya ma na enwebeghi nkwekorita siri ike maka ya bu olu ewepu Padmavati bu nke ona aru ugbua,mana onye obula gewe nti mgbe oga eme nkwuputa maka ya di ka Shahid  siri kwuo.

bollywood-akukwo-india-ejije

Ihe ejije ikpeazu Shahid mere bu Rangoon nke Vishal Bhardwaj bu onye nwe ya, mana osi na ya bu ihe ejije azuputaghi onu ya n’ahia, okwuru na onwere nkuda nmuo mgbe ohuru ozi edemede ndi mmadu na ezite maka ya bu ejije ma na ekwe nkwa na nke ya na Bhardwaj mere ohuru ga eme ofuma.

GWO NKA: Abali 29 Nke Ọnwa Mee Bu Ụbochi Ezum-Ike Ọchichi Onye Kwuo Uche Ya

   Okwuru na ona adi nwute ma n’akuda nmuo mgbe ihe ejije n’azutaghi onu ya n’ahia ma obu na enweghi ihe odide ozi agbamume sochiri ya, mana obi di ya uto na ndi mmadu guru ya n’anya ma nweekwa nmasi n’ihe omere na ya bu Rangoon n’agbanyeghi oru obula osiri di.

Obi di ya uto na ndi mmadu choputara oru ya na ya bu ejije ka okwuru ma kwukwaa si na ozi ha ga eme ga amagbu onwe ya, yabu ihe ejije nwekwara ndi otu ya bu ndi okacha mara ndi ozi so na ya, bu ndi gunyere, Kangana Ranaut nakwa Said Ali Khan bu ndi so ndi isi(lead).

  Okwuru na Kangaroo nwere mgbali siri ike etinyere na ya bu oru ma tinyekwara ndi okacha mara sokwu na ya, ogaghi ewere ya bu ihe ejije di ka na obu nke ya mana obi di ya uto na ndi mmadu choputara oru ya ma kwado ya na ya bu ihe ejije.

Oburu na ichoo imatakwu banyere akukoa na ozi yiri ya ngwa sonyerem n’ikuku ma obu na oha nto akukom.