Skip to content

ỌCHịCHị ETITI GA-EWEPUTA ỤGWỌ ỌNWA ỌHỤRỤ N’OGE N’ADịGHị ANYA – AYUBA

Ọchịchị etiti adịla njikere iweputa ụgwọ ọnwa ọhụrụ n’oge n’adịghị anya dị òtù ehiwere maka ụgwọ ọnwa ọhụrụ mecharala ozi edinyere ha.

Òtù a emechala nchọcha ha ma zigara onyeisiala ka ọbịanye aka na ya.

Ọ bụ onye isi òtù na-ahụ maka ndị ọrụ n’ala anyị bụ Ayuba Wabba kwuru nke a n’ụbọchị Mọnde mgbe ya na ndị ntọ akụkọ na-akparịta.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na òtù a ehiwere maka ụgwọ ọnwa ọhụrụ jịrị abalị abụọ nọkọọ ma weputa ụgwọ ọnwa ọhụrụ nke onye ọrụ ọ bụla nabatara.

Ayuba kwuru sị ‘A na ma ekwe ndị orụ nkwa  na tupu izu ụka a agwụ, onyeisiala ga-abịanye aka n’akwụkwọ gbasara ya’.