Skip to content

ỌCHỊCHI ETITI GA-EWE UMỤ OKORỌBỊA PỤKỤ ISE N’ỌRỤ

Ọchịchị etiti ekwuola na ọ ga-ewe ụmụ okorọbịa pụkụ ise n’enweghị ọrụ n’ọrụ. Ọrụ a bụkwa nke dị n’isi ọchịchị ala anyị dị n’Abuja n’ụkpụrụBasic Registry and Information System in Nigeria (BRISIN) scheme”.

Onyeisioche nke ụkpụrụ a (BRISIN) bụ Mazi Anthony Ụwa kwuru na mgbe ha tinyechara ihe n’ọru, na ọtutụ ndi Naịjịrịa ka a ga-ewe n’ọrụ.

Gukwuo: LINDA IKEJI AMỤỌLA NWA NWOKE N’ATLANTA

O kwukwara na data a ga-enweta ga-enye aka iji were hazie akụ na ụba obodo anyị nke ọma.

BRISIN bụ usoro jikọtara nchịkọta, nchekwa na mgbasa ozi iji kwado akụ na ụba ala anyị. Ụwa  gakwara n’ihu kwuo na ndị a ga-ewe n’ọru bụ ndị nwere asambodo sekọndịrị ruo na nke Phd.  Ọ rịọro ndi hụrụ ala anyị n’anya ka ha bịa kwadoo ụkpụrụ a.