Skip to content

ỌCHỊCHỊ ETITI EKWELA NKWA INYERE NDỊ IDE MMIRI NA-ENYE NSOGBỤ AKA

Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari ekwuola na ya ga-enyere ndị nịịle ide mmịrị metụtara n’ala anyị bụ Naịjịrịa aka.

Buhari rịọrọ ndị otu gọmenti dị iche iche ka ha were ike na nakwa ihe ndị ha nwere nyere ndị ide mmịrị na-enye nsogbu n’ala anyị.

GUKWUO: OMISORE CHỌRỌ KA ỌCHỊCHỊ ETITI CHỌPỤTA NDỊ GBỤRỤ BOLA IGE

Ọ bụ Femi Adesina kwuru nke a n’ụbọchị Tuzdee. Adesina kwụrụ na iwụ a onyeisiala nyere bụ nke a ga-eziga site n’aka onyeisi otu na-ahụ maka gbata gbata n’ala anyị bụ ‘National Emergency Management Agency’ (NEMA) bụ Mustapha Maihaja.

Adesina gakwara n’ihu kwuo n’onyeisiala ekwuola ka a gwa ya otu gọmenti ọbụla jụrụ inyere ndị a ide mmịrị na-enye nsogbụ aka.

Onyeisiala kwuru n’ọchịchị ya ga-eme ihe niile onwere ike ime iji nyere ndị niile ide mmịrị metutara.