Skip to content

ỌCHỊCHỊ ETITI EKWELA NKWA INYERE MBA SOUTH SUDAN AKA

Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari ekwuola n’ala anyị bụ NỊajịrịa ga-enyere mba South Sudan aka n’ihe gbasara ndorọndọrọ ọchịchị na-akụ na ụba.

Onyeisiala kwuru nke a n’Abuja mgbe ọ na-anabata Maazị Ezekiel Gatkuoth bụ onye nnọchịte anya Onyeisiala mba South Sudan n’ụbọchị Tụzdee.

GUKWUO: ANYị ACHỌGHị IBULI ỤGWỌ AKWỤKWỌ NDị NỌ NA MAHADUM – ỌCHịCHị ETITI

Buhari gara n’ihu kwuo na ala anyị bụ NỊajịrịa na mba South Sudan nwere otụtụ ihe oyiri n’ihe gbasara mmepe. Onyeisiala nyere ndị ǹdú mba South Sudan ndụmọdụ ka ha tinye ike ha niile ime ka obodo ha kwuru chịm.

Buhari gakwara n’ihu gwa ha ka ha nye ndị obodo ha ọrụ ọkachasi ndị ntorọbịa. Ọ bụghị naanị nke a, ọ gwakwara ha ka ha lenye anya n’ihe gbasara mpụ na ịrị ngarị n’obodo ha.

Maazị Gatkuoth kelere Onyeisiala, ma kwuo na ama Buhari ama n’Afrika maka ịchụ mpụ na ịrị ngarị ọsọ ụ́kwụ́ eruala.