Skip to content

OBI OLA EDO MERCY JOHNSON

Onye na eme ihe ejije ama ama n’ime Nollywood ma burukwa onye isi n’enyere aka na achi steeti Kogi aka n’ihe gbasara omenala nakwa ihe egwuregwu/nturundu nke obodo ha,bu Mercy Johnson ekpebiela na ya ga enyeghachi obodo ya ngozi ha nyere ya site n’ikwado ya, di ka nwanyi nwere obi Sara mbara, Mercy Johnson hiwere ime nchoputa nke akaraka bu (talent hunt)na asusu bekee, bu nke omewere ndi na eto eto n’ala kogi iji wee gosi ha na obi di ya uto n’nkwado nile ha nyere mgbe oka na ebido ebido, wee ruo ebe ono taa.

Ya bu ime nchoputa akaraka bu nke okporo GYB bu maka ime nchoputa ndi ma ka esi eme ihe ejije na obodo kogi ma mee ka ha puts ihe n’ime otu ndi n’eme ihe ejije na ala anyi dika NNE nke umu ato si kwuo na oha nto akuko ya bu Instagram.

Okwuru na nkea bu uzo oga esi nyeghachi obodo dika onye nwetaworo ngozi di uku n’iso na otu n’ime ndi mmepa anya nke Nollywood, na ugbua ka umunne ya ndi nwoke na ndi nwanyi n’ime kogi ga erite uru n’aka ya.

Ambode Won’t Stop Until He Destroys Computer Village

Ya bu njem ime nchoputa akaraka bu nke ga ebido na abali iri na asaa nke onwa a n’ogige Civic Center na Okehi Kogi nakwa abali nke iri na asato n’ime ogige ezumezu okpuru ochichi Idah(idah LGA Hall), aga emekwa ya na abali iri na itolu n’ime ogige ulo ihe nkiri nke Mahadum Steeti Kogi(Theatre arts hall of kogi state University)Ayingba, na mmechi ya ga Abu n’ulo oriri na ezumike Riverton(Riverton Hotel) n’abali iri abuo na otu nke onwa asato a bu August.

Dika Mercy Johnson so kwuo na ndi ahoputara n’ime ha ga esonyere ndi ama ama n’eme ihe ejije n’ime ihe ejije nwere agba, okwukwara na adi dika ,onye na eme ihe ejije nwoke bu Francis Duru na onye na eme ihe ejije nwayi bu Bimbo Akintola nakwa onye nhazi ihe ejije bu Frank Rajah Arase bu ndi ga ewere onodu dika ndi ikpe nke ya bu emume.

Oburu na ichoo imatakwu banyere nkea ma obu ndi yiri ya, sonyerem n’ikuku ma obu na oha into akuko @isimbidotv