Skip to content

NYE NDỊ ỌRỤ UGBO IDE MMịRị MEBIRI UGBO HA EGO ITI AKA N’OBI – EZE ONYIA

Otu eze ọdịnaala si n’Ọgbaru nke dị na steeti Anambra bụ Eze Emmanuel Onyia agwala ndị gọmentị ka ha nye ndị ọrụ ugbo ide mmịrị mebiri ọrụ ugbo ha ego iti aka n’obi.

Onyia kwuru nke a n’ụbọchị Wenezdee mgbe ndị ntọ akụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ n’Awka. Ọ gara n’ihu kwaa arirị ka ide mmịrị sirila mebie ọtụtụ ọrụ ugbo dị na steeti ahụ.

Onyia kwukwara na ide mmịrị metutara obi eze ya. Ọ rịọrọ gọmentị ka ha gbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka ọkachasị ndị ọrụ ugbo bụkwa ndị ide mmịrị bụụrụ ihe ndị ha kụrụ n’ụbị.