Skip to content

NYE ANYỊ ỌKWA OSOTE ONYEISIALA MAỌBỤ CHEFUO ITUNYERE ỤNỤ VOTU – ỌHANAEZE ‘YOUTHS’ GWARA PDP

Ọhanaeze Youths agwala otu pati PDP ka ha nye ndị Igbo ọkwa osote onyeisiala na ntụliaka onye ọgaara ha ga-eme n’ịzụụka ọzọ maọbụ chefuo votu ha na ntuliaka a ga-eme na 2019. Ha kwukwara na ha ga-atunyere otu pati APC votu ha ma ọ bụrụ na nke a emeghị.

GUKWUO: NDI BOKO HARAM AWAKPOLA OBODO ATỌ NA STEETI BORNU MA GBUO MMADỤ ISII

Otu a kwuru nke a n’Abakaliki mgbe ha nwere nzụkọ gbasara ndị Igbo nakwa ntuliaka elu nke afọ 2019.

N’akwụkwọ bụkwa nke osote onyeisi nke otu a n’ụwa niile bụ Obinna Achionye nakwa onyeisi otu a na steeti Ebonyi bụ Maazi Alex Okemiri, bịanyere aka na ya kwuru na pati PDP bụkwa nke Prince Uche Secondus bụ onyeisi ya na-akpa nkata  inye onye n’abụghị onye Igbo ọkwa osote onyeisiala.

Otu a gakwara n’ihu kwado Ike Ekweremadu maka ntuliaka elu a ga-eme n’afọ ọzọ.