Skip to content

NUPENG ESONYELA NLC NA NFANYEAKA N’Ụ́kWỤ́

E nwere ike inwe ihe mkpọbị ụ́kwụ́ n’ihe gbasara ibusa mmanụ ụgbọala n’ala anyị dịka òtù na-ahụ maka ibụsa mmanụ ụgbọala n’ala anyị bụ NUPENG esonyela NLC na nfanyeaka n’ụ́kwụ́ nke ha bidoro n’ụbọchị Tọzdee.

NLC nọrọ  n’ụbọchị Wenezdee gwa ndị ọrụ ka ha bido nfanyeaka n’ ụ́kwụ́ n’ihi na ọchịchị etiti emejuputaghị ụgwọ ọnwa ọhụrụ ha chọrọ.

GUKWO: A GA M ENWETA MMERI N’ỤLỌIKPE – ADELEKE

Onye na-ekwuchitere òtù NUPENG ọnụ bụ Maazị Adamson Momoh kwuru na ha so n’òtụ̀ NLC, ya mere na ha ga-eme ihe ọ bụla NLC kwurụ.

O bụladị onye na-ekwuchiere PENGASSAN ọnụ bụ Maazị Fortune Obi, kwụrụ na enyela òtù ha iwu isonye na nfanyeaka n’ụ́kwụ́ a na-aga n’ihu ụgbụ a.

Mana onye na-ekwuchitere ‘Nigerian National Petroleum Corporation’ (NNPC) ọnụ kwụrụ na ya echeghị na nfanyeaka n’ụ́kwụ́ nke ndị ọrụ ga-emetuta mmanụ ụgbọala.