Skip to content

NLC EBIDOLA NFANYEAKA N’UKWU TÁÀ

Otu jikọrọ ndị ọrụ n’ala anyị bụ ‘Nigerian Labour Congress’ (NLC) ebidola nfanye aka n’ụkwụ taa.  Nke a bụ iji mee ka ọchịchị etiti mejupụta ugwọ ọnwa ọhụrụ maka ndị ọrụ.

Ndị otu a na minista na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Dr. Chris Ngige nwere nzụkọ n’ụbọchị Wenezdee bụkwa nke n’enweghị ihe ha meputara.

GUKWUO: IDE MMIRI EGBUOLA NWA NỌ AFỌ ITOLỤ N’ANAMBRA STEETI

Onyeisi otu NLC bụ Ayuba Wabba kwuru na ha ga afanye aka n’ụkwụ n’ihi na-ọchịchị etiti ajụla inwe nzukọ ya na otu ihe gbasara ugwọ ọnwa ọhụụ.

Ayuba kwuru na ha agwala ndị niile na-arụrụ gọmenti nakwa ndị na-arụrụ ndị nkịtị ka ha sonye na nfanye aka n’ukwu a.

Ndị ọrụ na-achọ ka akwụọ ha puku naịra ịrị ise karịa puku naịra ịrị na asatọ ọchịchị etiti na-akwụbu ha.